25Nʼụzọ dị otu a, nkewa ọbụla adịghị nʼahụ mmadụ. Akụkụ ọbụla maara mkpa ibe ya, ha na-egborịtakwara onwe ha mkpa ha.
26Ọ bụrụ na otu akụkụ enwe nsogbu, akụkụ ndị ọzọ ga-eketa oke na nsogbu ahụ. Ọ bụrụkwa na otu akụkụ emee ihe ga-eweta otuto ọ bụ ahụ niile na-enwe otuto ahụ.
27Ugbu a, unu niile nʼotu nʼotu bụ otu anụ ahụ Kraịst. Unu bụkwa akụkụ ahụ ya nʼotu nʼotu, bụrụkwa ndị dị mkpa nʼahụ ahụ.
28Nke a bụ ụfọdụ nʼime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị; nke mbụ bụ ndị ozi, ndị amụma, ndị nkuzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe niile nʼusoro, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche.
29Ha niile, ha bụ ndị ozi? Ha niile ha bụ ndị amụma? Ha niile ha bụ ndị nkuzi? Ha niile ha bụ ndị ọrụ ebube?