27Ugbu a, unu niile nʼotu nʼotu bụ otu anụ ahụ Kraịst. Unu bụkwa akụkụ ahụ ya nʼotu nʼotu, bụrụkwa ndị dị mkpa nʼahụ ahụ.
28Nke a bụ ụfọdụ nʼime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị; nke mbụ bụ ndị ozi, ndị amụma, ndị nkuzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe niile nʼusoro, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche.
29Ha niile, ha bụ ndị ozi? Ha niile ha bụ ndị amụma? Ha niile ha bụ ndị nkuzi? Ha niile ha bụ ndị ọrụ ebube?
30Ha niile ha nwere onyinye ịgwọ ọrịa? Ha niile ha na-asụ nʼolu dị iche iche? Ha niile ha nwere onyinye nke ịkọwa asụsụ dị iche iche?
31Ugbu a, gbalịsienụ ike inweta onyinye kachasị dị elu karịa. Ma aga m ezi unu ụzọ nke kachasị ihe a niile mma.