1Ka ịhụnanya bụrụ isi ihe unu na-achọ. Chọsienụ onyinye nke Mmụọ Nsọ ike, nke ka nke onyinye inwe ike ibu amụma.
2Onye ọbụla na-asụ asụsụ ọ na-amụghị amụ, bụ Chineke ka ọ na-agwa okwu, ọ bụghị mmadụ. Nʼezie, ọ dịghị onye na-aghọta ihe ọ na-ekwu; nʼihi na okwu ọ na-ekwu bụ ihe omimi site nʼike Mmụọ Nsọ.
3Ma onye ọbụla na-ebu amụma na-ezisa ozi na-enyere ndị mmadụ aka ito eto. Ọ na-agwakwa ha okwu nkasiobi na okwu na-ebuli mmụọ ha elu.
4Ya mere, onye ahụ na-ebu amụma na-enyere chọọchị aka, ma onye ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere naanị onwe ya aka.