20Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nʼechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nʼihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nʼihe gbasara ụdị okwu a.
21E dere ya nʼakwụkwọ iwu, “Site na egbugbere ọnụ ndị mba ọzọ sitekwa nʼire ndị na-asụ iche iche ka m ga-agwa ndị a okwu, ma ọbụladị otu a, ha agaghị ege m ntị, ka Onyenwe anyị kwuru.”
22Ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe nlere anya nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma bụ maka ndị kwere ekwe, ọ bụghị maka ndị na-ekweghị ekwe.
23Ọ bụrụ na nzukọ niile ezukọọ nʼọgbakọ ekpere, mmadụ niile a na-asụ nʼolu dị iche iche nʼotu mgbe, ọ bụrụkwa na ndị na-aghọtaghị, maọbụ ndị na-ekweghị ekwe abata nʼebe ahụ, gịnị ka ha ga-ekwu? Ha ọ gaghị asị na isi emebiela ndị a?
24Ma ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe maọbụ onye ọhụrụ abata mgbe onye ọbụla na-ebu amụma, ha ga-abụ ndị mmadụ niile ga-atụ mmehie ha nʼanya maakwa ha ikpe mmehie.