28Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche na chọọchị mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịta ya.
29Ka mmadụ abụọ maọbụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nʼotu nʼotu, ka ndị ọzọ tulee ihe ha kwuru.
30Ọ bụrụ na-ekpughere onye ọzọ nọdụ nʼakụkụ ya ihe, ka onye mbụ mechie ọnụ ya.
31Nʼihi na unu nwere ike ibu amụma nʼotu nʼotu, ka mmadụ niile nwee ike ịmụta ihe ma bụrụkwa ndị a gbara ume.
32Mmụọ niile nke ndị amụma ka a na-edokwa nʼokpuru ndị amụma.