1 Ndị Kọrint 14

Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ unu na-adịghị aghọta, ole uru m baara unu, ma ọ bụghị ma m na-ekwu okwu banyere ihe ekpughere gosi m, maọbụ ihe niile m maara, maọbụ ihe gaje ime, maọbụ ihe nkuzi?

1 Corinthians 14:6 (UKJV) Now, brethren, if I come unto you speaking with tongues, what shall I profit you, except I shall speak to you either by revelation, or by knowledge, or by prophesying, or by doctrine?

4Ya mere, onye ahụ na-ebu amụma na-enyere chọọchị aka, ma onye ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere naanị onwe ya aka.

5Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu niile nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche; ma ọ ga-atọ m karịa ma ọ bụrụ na unu niile enwee onyinye ibu amụma. Nke a bụ nʼihi na onye ahụ na-ebu amụma bara uru karịa onye na-asụ asụsụ dị iche iche. Ịsụ asụsụ ya ga-aba uru ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-aghọta ihe ọ na-asụ, ka e nwee ike wulie chọọchị.

6Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ unu na-adịghị aghọta, ole uru m baara unu, ma ọ bụghị ma m na-ekwu okwu banyere ihe ekpughere gosi m, maọbụ ihe niile m maara, maọbụ ihe gaje ime, maọbụ ihe nkuzi?

7Ọ bụkwa otu a ka ọ dị nʼetiti ihe niile na-enweghị ndụ, nke na-ada ụda, dịka ọja, maọbụ ụbọ akwara. Ọ bụrụ na ha enyeghị ụda dị iche site na nke ọzọ, olee ụzọ mmadụ ga-eji mara maọbụ ọja ka a na-afụ, maọbụ ụbọ akwara ka a na-akpọ.

8Ọ bụrụkwa na opi ike e ji akpọ ndị agha oku adapụtaghị ụda nke ọma, onye ga-ejikere ije agha?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.