1 Ndị Kọrint 14

Nʼotu aka ahụ kwa, ọ bụrụ na ị na-agwa mmadụ okwu nʼasụsụ ọ na-adịghị anụ, olee otu ọ ga-esi ghọta ihe ị na-ekwu? Nʼoge ahụ, ifufe ka unu na-agwa okwu.

1 Corinthians 14:9 (UKJV) So likewise all of you, except all of you utter by the tongue words easy to be understood, how shall it be known what is spoken? for all of you shall speak into the air.

7Ọ bụkwa otu a ka ọ dị nʼetiti ihe niile na-enweghị ndụ, nke na-ada ụda, dịka ọja, maọbụ ụbọ akwara. Ọ bụrụ na ha enyeghị ụda dị iche site na nke ọzọ, olee ụzọ mmadụ ga-eji mara maọbụ ọja ka a na-afụ, maọbụ ụbọ akwara ka a na-akpọ.

8Ọ bụrụkwa na opi ike e ji akpọ ndị agha oku adapụtaghị ụda nke ọma, onye ga-ejikere ije agha?

9Nʼotu aka ahụ kwa, ọ bụrụ na ị na-agwa mmadụ okwu nʼasụsụ ọ na-adịghị anụ, olee otu ọ ga-esi ghọta ihe ị na-ekwu? Nʼoge ahụ, ifufe ka unu na-agwa okwu.

10Asụsụ a na-asụ nʼụwa a dị ukwuu, ma ha niile bara uru nye ndị na-anụ ha.

11Ọ bụrụ na m aghọtaghị ihe onye na-asụ otu nʼime asụsụ ndị a na-ekwu, aga m abụ ọbịa nʼebe onye na-asụ asụsụ ahụ nọ, ya onwe ya ga-abụkwa ọbịa nʼebe m nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.