1Ụmụnna m, ugbu a achọrọ m ime ka unu cheta oziọma ahụ m ziri unu mgbe m buru ụzọ bịakwute unu, nke unu kweere na ya, na nke unu guzosikwara ike nʼelu ya.
2E si nʼoziọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nʼihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka.
3Ihe m nyefere unu nʼaka na mbụ bụ ozi ahụ m natara ị debe, nke dị oke mkpa, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie anyị, dịka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ.