9Nʼihi na ọ bụ m kachasị nta nʼime ndị ozi. O kwesikwaghị ka a akpọọ m onyeozi ya nʼihi na alụsoro m nzukọ Chineke ọgụ nke ukwuu.
10Ma site nʼamara nke Chineke, abụ m ihe m bụ. Ọ pụtakwara na amara ya nʼebe m nọ abụghị ihe efu. Kama arụsịrị m ọrụ ike karịchasịa ndị ozi niile. Ma nʼezie, ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ ya nʼime m.
11Ma ọ bụ m, maọbụ ndị ọzọ, otu a ka anyị siri kwusaa, otu a ka unu sikwa kwere.
12Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na Kraịst si nʼọnwụ bilie, gịnị mere ụfọdụ unu ji na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ apụghị isi nʼọnwụ bilie ọzọ.
13Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ a pụghị i si nʼọnwụ bilie, nke a pụtara na e meghị ka Kraịst site nʼọnwụ bilie.