1 Ndị Kọrint 15

Nʼihi na, ọ bụrụ na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ bilie dị ndụ ọzọ, emekwaghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie.

1 Corinthians 15:16 (UKJV) For if the dead rise not, then is not Christ raised:

14Ọ bụrụkwa na e meghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, ihe anyị na-ezisa bụ ihe efu, okwukwe unu nwere bụkwa ihe efu.

15Ma karịa nke a, a na-ahụta anyị ka ndị ama ụgha nke Chineke, nʼihi na anyị gbara ama banyere Chineke, na-asị na o mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, bụ onye ọ na-emeghị ka o si nʼọnwụ bilie ma ọ bụrụ na-emeghị ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ.

16Nʼihi na, ọ bụrụ na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ bilie dị ndụ ọzọ, emekwaghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie.

17Ma ọ bụrụ na-emeghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, okwukwe unu bụ ihe efu, unu ka ga-anwụ na mmehie unu.

18Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ nʼime Kraịst lara nʼiyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.