19Ọ bụrụkwa na olileanya anyị nʼime Kraịst gwụrụ naanị na ndụ anyị nʼime ụwa a, anyị bụ ndị e kwesiri ka e mere ebere.
20Ma e mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie nʼezie, onye mbụ nʼetiti ndị niile nwụrụ anwụ.
21Nʼihi na dịka ọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa, otu a kwa ka mbilite nʼọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa.
22Dịka mmadụ niile si anwụ site nʼaka Adam, otu a kwa ka mmadụ niile ga-esi dịkwa ndụ nʼime Kraịst.
23Onye ọbụla ga-ebili nʼusoro nke ya, Kraịst mkpụrụ mbụ si nʼọnwụ bilie. Mgbe ọ lọghachiri, ndị niile bụ ndị nke Kraịst ga-esote.