1 Ndị Kọrint 15

Ọ bụrụkwa na olileanya anyị nʼime Kraịst gwụrụ naanị na ndụ anyị nʼime ụwa a, anyị bụ ndị e kwesiri ka e mere ebere.

1 Corinthians 15:19 (UKJV) If in this life only we have hope in Christ, we are of all men most miserable.

17Ma ọ bụrụ na-emeghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, okwukwe unu bụ ihe efu, unu ka ga-anwụ na mmehie unu.

18Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ nʼime Kraịst lara nʼiyi.

19Ọ bụrụkwa na olileanya anyị nʼime Kraịst gwụrụ naanị na ndụ anyị nʼime ụwa a, anyị bụ ndị e kwesiri ka e mere ebere.

20Ma e mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie nʼezie, onye mbụ nʼetiti ndị niile nwụrụ anwụ.

21Nʼihi na dịka ọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa, otu a kwa ka mbilite nʼọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.