1 Ndị Kọrint 15

Nʼihi na ọ ga-abụ eze tutu ruo mgbe ọ lụgburu ndị iro ya niile, doo ha nʼokpuru ụkwụ ya.

1 Corinthians 15:25 (UKJV) For he must reign, till he has put all enemies under his feet.

23Onye ọbụla ga-ebili nʼusoro nke ya, Kraịst mkpụrụ mbụ si nʼọnwụ bilie. Mgbe ọ lọghachiri, ndị niile bụ ndị nke Kraịst ga-esote.

24Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ ihe niile ga-abịa, mgbe ọ ga-enyefe alaeze nʼaka Chineke bụ Nna, nʼihi na o meriela ịchị isi niile, na ikike niile na ike niile.

25Nʼihi na ọ ga-abụ eze tutu ruo mgbe ọ lụgburu ndị iro ya niile, doo ha nʼokpuru ụkwụ ya.

26Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ.

27Nʼihi na “O doola ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Ma mgbe ọbụla asịrị, “e doola ihe niile” nʼokpuru ụkwụ ya, o doro anya na Chineke agụnyeghị onwe ya, nʼihi na ọ bụ ya tinyere ihe niile nʼokpuru Kraịst.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.