26Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ.
27Nʼihi na “O doola ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Ma mgbe ọbụla asịrị, “e doola ihe niile” nʼokpuru ụkwụ ya, o doro anya na Chineke agụnyeghị onwe ya, nʼihi na ọ bụ ya tinyere ihe niile nʼokpuru Kraịst.
28Mgbe e merela ka ihe niile nọrọ nʼokpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ya nʼonwe ya, ga-edobe onwe ya nʼokpuru onye ahụ dobere ihe niile nʼokpuru ya, ka Chineke bụrụ onye na-achị ihe niile.
29Ma ọ bụghị otu a, gịnị mere ụfọdụ ji eme ndị otu ha baptizim nʼọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie ma ọlị, nʼihi gịnị ka a na-eme mmadụ ndị a baptizim nʼọnọdụ ha?
30Gịnị mere anyị ji nọrọ nʼize ndụ nʼoge awa ọbụla?