32Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nʼụwa a, dịka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nʼihi ọgụ m na-alụso anụ ọhịa, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi anyị ga-anwụ.”
33Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa.
34Sitenụ na ndụ enweghị nghọta unu lọghachita dịka unu kwesiri, unu emehiekwala ọzọ. Nʼihi na-enwere ụfọdụ bụ ndị na-amaghị Chineke. Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu.
35Ma ụfọdụ ga-ajụ, “Olee otu a ga-esi mee ka onye nwụrụ anwụ bilie? Olee ụdị ahụ ha ga-enwe mgbe ha ga-apụta?”
36Onye nzuzu! Mkpụrụ ọka i tinyere nʼala agaghị epu ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nwụọ.