1 Ndị Kọrint 15

Onye nzuzu! Mkpụrụ ọka i tinyere nʼala agaghị epu ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nwụọ.

1 Corinthians 15:36 (UKJV) You fool, that which you sow is not quickened, except it die:

34Sitenụ na ndụ enweghị nghọta unu lọghachita dịka unu kwesiri, unu emehiekwala ọzọ. Nʼihi na-enwere ụfọdụ bụ ndị na-amaghị Chineke. Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu.

35Ma ụfọdụ ga-ajụ, “Olee otu a ga-esi mee ka onye nwụrụ anwụ bilie? Olee ụdị ahụ ha ga-enwe mgbe ha ga-apụta?”

36Onye nzuzu! Mkpụrụ ọka i tinyere nʼala agaghị epu ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nwụọ.

37Mgbe ị na-agha mkpụrụ, ọ bụghị anụ ahụ nke ga-apụta ka ị na-agha, kama ọ bụ naanị mkpụrụ nkịtị, eleghị anya mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ mkpụrụ ọzọ.

38Ma Chineke na-enye ya ahụ dịka o si chọọ. Ọ na-enyekwa mkpụrụ ọbụla nʼime mkpụrụ niile ahụ nke kwesiri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.