48Dị ka mmadụ nke mbụ ahụ e jiri aja kpụọ dị, otu a ka ndị niile si nʼaja pụta dịkwa. Ma dị ka mmadụ nke eluigwe ahụ dị, otu a ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dịkwa.
49Dịka anyị niile yikwasịrị onyinyo nke nwoke e jiri aja kpụọ, otu ahụkwa ka anyị ga-esi yikwasị onyinyo nke nwoke nke eluigwe.
50Ihe m na-ekwu, ụmụnna m, bụ na anụ ahụ na ọbara enweghị ike iketa alaeze Chineke. Ihe na-ere ure agaghịkwa eketa ereghị ure.
51Ma geenụ ntị ka m gwa unu ihe omimi a! Ọ bụghị anyị niile na-aga ịnwụ, kama, a ga-enye anyị anụ ahụ ọhụrụ nke pụrụ iche.
52Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị.