4Na e liri ya, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ, dịka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme.
5O gosiri Sefas onwe ya, emesịa, ndị ozi iri na abụọ ahụ hụkwara ya.
6Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise nʼime ụmụnna onwe ya, nʼotu mgbe, ọtụtụ nʼime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nʼime ha adaala nʼụra ọnwụ.
7Emesịa, Jemis hụrụ ya; o mekwara ka ndị ozi niile hụ ya.
8Nʼikpeazụ, mụ onwe m hụkwara ya, dịka a ga-asị na m bụ nwa a na-amụghị nʼoge.