1Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya banyere ihe omimi niile nke okwu Chineke.
2Nʼihi na ekpebiri m na naanị ihe m ga-ama nʼetiti unu bụ naanị ihe banyere Jisọs Kraịst na mkpọgbu a kpọgburu ya nʼelu obe.
3Abịakwutere m unu nʼọnọdụ adịghị ike, oke ụjọ na ahụ ịma jijiji.