1 Ndị Kọrint 2

Abịakwutere m unu nʼọnọdụ adịghị ike, oke ụjọ na ahụ ịma jijiji.

1 Corinthians 2:3 (UKJV) And I was with you in weakness, and in fear, and in much trembling.

1Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya banyere ihe omimi niile nke okwu Chineke.

2Nʼihi na ekpebiri m na naanị ihe m ga-ama nʼetiti unu bụ naanị ihe banyere Jisọs Kraịst na mkpọgbu a kpọgburu ya nʼelu obe.

3Abịakwutere m unu nʼọnọdụ adịghị ike, oke ụjọ na ahụ ịma jijiji.

4Okwu m na ihe m kwusara abịakwaghị dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara nʼụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na ike ya.

5Ka okwukwe unu ghara ịdabere nʼamamihe mmadụ, kama ka ọ dabere nʼike Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.