1 Ndị Kọrint 2

Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi.

1 Corinthians 2:10 (UKJV) But God has revealed them unto us by his Spirit: for the Spirit searches all things, yea, the deep things of God.

8O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe.

9Ma dịka e dere ya, “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”

10Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi.

11Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke.

12Ma mmụọ nke anyị natara abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị nwee ike ịghọta onyinye amara niile Chineke nyere anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.