6Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi.
7Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto.
8O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe.
9Ma dịka e dere ya, “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”
10Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi.