1 Ndị Kọrint 4

Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị.

1 Corinthians 4:11 (UKJV) Even unto this present hour we both hunger, and thirst, and are naked, and are buffeted, and have no certain dwelling place;

9Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi.

10Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ.

11Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị.

12Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi.

13Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.