1 Ndị Kọrint 4

Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa.

1 Corinthians 4:13 (UKJV) Being defamed, we implore: we are made as the filth of the world, and are the waste of all things unto this day.

11Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị.

12Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi.

13Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa.

14Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya.

15Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.