13Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa.
14Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya.
15Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu.
16Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m.
17Nʼihi nke a, ana m ezitere unu Timoti, bụ ezi nwa m onye m hụrụ nʼanya, nke kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị. Ọ ga-echetara unu otu m si e bi ndụ nʼime Onyenwe anyị Kraịst Jisọs, dịka m na-akụzi ya nʼebe niile na nzukọ niile.