16Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m.
17Nʼihi nke a, ana m ezitere unu Timoti, bụ ezi nwa m onye m hụrụ nʼanya, nke kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị. Ọ ga-echetara unu otu m si e bi ndụ nʼime Onyenwe anyị Kraịst Jisọs, dịka m na-akụzi ya nʼebe niile na nzukọ niile.
18Ụfọdụ nʼime unu amalitela ịfụlị onwe ha elu, chee na mụ enweghị ike ịbịakwute unu ọzọ.
19Ma site nʼike Onyenwe anyị, aga m abịa ịhụ unu anya nʼoge na-adịghị anya. Mgbe m bịara, aga m achọpụta ihe ndị ahụ na-akpa nganga pụrụ ime, ọ bụghị ihe ha nwere ike ikwu.
20Nʼihi na alaeze Chineke abụghị ihe okwu ọnụ kama ọ bụ ngosipụta ịdị ike.