1 Ndị Kọrint 6

Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m.

1 Corinthians 6:12 (UKJV) All things are lawful unto me, but all things are not expedient: all things are lawful for me, but I will not be brought under the power of any.

10ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke.

11Na mbụ, ụfọdụ nʼime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼime Mmụọ nke Chineke anyị ka a gụrụ unu ka ndị ezi omume.

12Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m.

13Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị.

14Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.