1 Ndị Kọrint 6

Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie.

1 Corinthians 6:14 (UKJV) And God has both raised up the Lord, and will also raise up us by his own power.

12Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m.

13Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị.

14Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie.

15Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa!

16Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.