14Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie.
15Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa!
16Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”
17Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ.
18Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.