1 Ndị Kọrint 6

Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu?

1 Corinthians 6:7 (UKJV) Now therefore there is utterly a fault among you, because all of you go to law one with another. Why do all of you not rather endure wrong? why do all of you not rather suffer yourselves to be defrauded?

5Ana m ekwu nke a ime ka ihere mee unu. Ọ ga-abụ na e nweghị ike ịchọta ọ bụladị otu onye maara ihe nʼetiti unu, onye ga na-ekpe ikpe dị nʼetiti nwanna na ibe ya?

6Ma lee, nwanna na-akpọrọ nwanna ya aga ụlọ ikpe, ka ndị na-ekweghị ekwe kpee ha ikpe!

7Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu?

8Ma unu onwe unu na-emejọ, ma na-aghọgbu, ọ bụladị ụmụnna unu nʼime Kraịst.

9Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.