1 Ndị Kọrint 6

Ma unu onwe unu na-emejọ, ma na-aghọgbu, ọ bụladị ụmụnna unu nʼime Kraịst.

1 Corinthians 6:8 (UKJV) Nay, all of you do wrong, and defraud, and that your brethren.

6Ma lee, nwanna na-akpọrọ nwanna ya aga ụlọ ikpe, ka ndị na-ekweghị ekwe kpee ha ikpe!

7Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu?

8Ma unu onwe unu na-emejọ, ma na-aghọgbu, ọ bụladị ụmụnna unu nʼime Kraịst.

9Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,

10ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.