9Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ.
10Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya.
11A sịkwa na ọ hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m.
12Ma ana m agwa mmadụ ndị ọzọ (nke a abụghị iwu nke Onyenwe anyị nyere). Ọ bụrụ na nwanna alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dịka nwunye ya.
13Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya alụkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ịnọgide dịka di ya.