10Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya.
11A sịkwa na ọ hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m.
12Ma ana m agwa mmadụ ndị ọzọ (nke a abụghị iwu nke Onyenwe anyị nyere). Ọ bụrụ na nwanna alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dịka nwunye ya.
13Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya alụkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ịnọgide dịka di ya.
14Nʼihi na edoola di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na nwunye ya, otu a kwa a na-edokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na di ya, bụ onye kwere ekwe. Ọ bụrụ na ọ dịghị otu a, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha. Ma otu ọ dị, ha dị nsọ.