14Nʼihi na edoola di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na nwunye ya, otu a kwa a na-edokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na di ya, bụ onye kwere ekwe. Ọ bụrụ na ọ dịghị otu a, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha. Ma otu ọ dị, ha dị nsọ.
15Ma ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya dịrị otu ahụ, nke a emeghị ka nwanna anyị nwoke maọbụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu nʼọnọdụ dị otu a, nʼihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị bie ndụ udo.
16Gị nwunye, ị mara maọbụ gị ga-azọpụta di gị? Ma, gị bụ di, si aṅa mara maọbụ gị ga-azọpụta nwunye gị?
17Ka onye ọbụla bie ndụ ya dịka amara Onyenwe anyị nyere ya si dị, nakwa nʼọnọdụ nke Chineke kpọrọ ya. Nke a bụ iwu m na-enye nʼụlọ chọọchị niile.
18Akpọrọ onye ọbụla mgbe e biri ya ugwu? Ya achọla iwepụ akara obibi ugwu ya. Ka onye a na-ebighị ugwu tupu ọkpụkpọ ya hapụ inye onwe ya nsogbu ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.