17Ka onye ọbụla bie ndụ ya dịka amara Onyenwe anyị nyere ya si dị, nakwa nʼọnọdụ nke Chineke kpọrọ ya. Nke a bụ iwu m na-enye nʼụlọ chọọchị niile.
18Akpọrọ onye ọbụla mgbe e biri ya ugwu? Ya achọla iwepụ akara obibi ugwu ya. Ka onye a na-ebighị ugwu tupu ọkpụkpọ ya hapụ inye onwe ya nsogbu ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.
19Nʼihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ihe kachasị mkpa bụ idebe iwu Chineke.
20Ka onye ọbụla nọgide dịka ọ dị mgbe a kpọrọ ya.
21Ị bụ ohu mgbe a kpọrọ gị? Echegbula onwe gị nʼihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, were ohere ahụ mee ihe ugbu a.