1 Ndị Kọrint 7

Ị bụ ohu mgbe a kpọrọ gị? Echegbula onwe gị nʼihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, were ohere ahụ mee ihe ugbu a.

1 Corinthians 7:21 (UKJV) Are you called being a servant? care not for it: but if you may be made free, use it rather.

19Nʼihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ihe kachasị mkpa bụ idebe iwu Chineke.

20Ka onye ọbụla nọgide dịka ọ dị mgbe a kpọrọ ya.

21Ị bụ ohu mgbe a kpọrọ gị? Echegbula onwe gị nʼihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, were ohere ahụ mee ihe ugbu a.

22Nʼihi na onye ọbụla Onyenwe anyị Chineke kpọrọ mgbe o bụ ohu, aghọọla onye nweere onwe ya nʼime Onyenwe anyị. Otu aka ahụ, onye nwerela onwe ya mgbe Onyenwe anyị kpọrọ ya aghọọla ohu nke Kraịst.

23Akwụọla ụgwọ isi unu, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.