1 Ndị Kọrint 7

Ị lụọla nwanyị? Achọla nkewa. Ọ bụ na ị lụbeghị nwanyị? Ejela ịchọ onye ị ga-alụ.

1 Corinthians 7:27 (UKJV) Are you bound unto a wife? seek not to be loosed. Are you loosed from a wife? seek not a wife.

25Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.

26Echere m na ọ ka mma ugbu a, nʼihi nsogbu nke na-abịanụ ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya dịka o siri nọrọ ugbu a.

27Ị lụọla nwanyị? Achọla nkewa. Ọ bụ na ị lụbeghị nwanyị? Ejela ịchọ onye ị ga-alụ.

28Ma ọ bụrụ na i kpebie nʼobi gị ịlụ nwunye, i meghị mmehie ọbụla; ọ bụrụkwa na nwaagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ọtụtụ nsogbu nʼime ụwa. Ọ ga-amasị m igbochiri unu nsogbu ndị ahụ.

29Ihe unu kwesiri ịma, ụmụnna, bụ na oge anyị nwere fọdụrụ naanị ntakịrị, site ugbu a gaa nʼihu ndị nwere nwunye ga-adị ndụ ha dịka ndị na-enweghị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.