26Echere m na ọ ka mma ugbu a, nʼihi nsogbu nke na-abịanụ ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya dịka o siri nọrọ ugbu a.
27Ị lụọla nwanyị? Achọla nkewa. Ọ bụ na ị lụbeghị nwanyị? Ejela ịchọ onye ị ga-alụ.
28Ma ọ bụrụ na i kpebie nʼobi gị ịlụ nwunye, i meghị mmehie ọbụla; ọ bụrụkwa na nwaagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ọtụtụ nsogbu nʼime ụwa. Ọ ga-amasị m igbochiri unu nsogbu ndị ahụ.
29Ihe unu kwesiri ịma, ụmụnna, bụ na oge anyị nwere fọdụrụ naanị ntakịrị, site ugbu a gaa nʼihu ndị nwere nwunye ga-adị ndụ ha dịka ndị na-enweghị.
30Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dịka ndị ihe anaghị ewute, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dịka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọbụla.