1 Ndị Kọrint 7

Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ niile nọrọ dị ka m. Ma onye ọbụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. O nyere otu onye nke a, onye ọzọ nke ọzọ.

1 Corinthians 7:7 (UKJV) For I would that all men were even as I myself. But every man has his proper gift of God, one after this manner, and another after that.

5Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.

6Anaghị m enye nke a dị ka iwu, kama ọ bụ alo ka m na-atụnyere unu.

7Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ niile nọrọ dị ka m. Ma onye ọbụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. O nyere otu onye nke a, onye ọzọ nke ọzọ.

8Ma ana m agwa ndị na-anọghị nʼọnọdụ di na nwunye na ndị di ha nwụrụ anwụ, na ọ ka mma ka ha nọdụ na-alụghị di maọbụ nwunye, dịka m onwe m nọ.

9Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.