1 Ndị Kọrint 7

Ma ana m agwa ndị na-anọghị nʼọnọdụ di na nwunye na ndị di ha nwụrụ anwụ, na ọ ka mma ka ha nọdụ na-alụghị di maọbụ nwunye, dịka m onwe m nọ.

1 Corinthians 7:8 (UKJV) I say therefore to the unmarried and widows, It is good for them if they abide even as I.

6Anaghị m enye nke a dị ka iwu, kama ọ bụ alo ka m na-atụnyere unu.

7Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ niile nọrọ dị ka m. Ma onye ọbụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. O nyere otu onye nke a, onye ọzọ nke ọzọ.

8Ma ana m agwa ndị na-anọghị nʼọnọdụ di na nwunye na ndị di ha nwụrụ anwụ, na ọ ka mma ka ha nọdụ na-alụghị di maọbụ nwunye, dịka m onwe m nọ.

9Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ.

10Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.