10E, nʼihi anyị ka eji dee ya nʼakwụkwọ. Nʼezie, e dere ihe ndị a nʼihi anyị, nʼihi na onye rụrụ ọrụ nʼubi na onye na-azọcha mkpụrụ dị nʼubi ahụ, na-eme nke a nʼolileanya na o kwesiri iketa oke site na mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta.
11Mkpụrụ anyị kụrụ nʼime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ụfọdụ nʼime akụnụba unu?
12Ọ bụrụ na ndị ọzọ kwesiri iketa uru dị otu a nʼahụ unu, ọ bụ na anyị ekwesighị iketa karịa? Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọbụla, kama anyị na-agbalịsị ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nʼoziọma Kraịst nke anyị wetara.
13Ọ bụ na unu amataghị na ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu na-esi nʼụlọnsọ ahụ na-eweta ihe ha na-eri? Ndị na-agbakwa odibo nʼebe ịchụ aja na-eketakwa oke nʼihe eji chụọ aja?
14Nʼotu aka ahụ kwa, Onyenwe anyị ekwuola na ndị niile na-ekwusa oziọma ya ga-esi nʼoziọma eweta nri ha ga-eri dị ndụ.