1 Ndị Kọrint 9

Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ.

1 Corinthians 9:18 (UKJV) What is my reward then? Verily that, when I preach the gospel, I may make the gospel of Christ without charge, that I abuse not my power in the gospel.

16Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma.

17A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka.

18Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ.

19Ọ bụ ezie na-abụghị m ohu onye ọbụla, ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ niile ka m nwee ike site nʼụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụobi nʼuru nye Kraịst.

20Nʼebe ndị Juu nọọ, ana m eme dịka onye Juu, ka m nwee ike rite ndị Juu nʼuru. Nʼetiti ndị nọ nʼokpuru iwu, ana m emekwa dịka otu nʼime ndị nọ nʼokpuru iwu (nʼagbanyeghị na mụ onwe m anọghị nʼokpuru iwu), ka m si otu a nwee ike rite ndị nọ nʼokpuru iwu nʼuru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.