15Ma o nweghị mgbe m jirila ike ndị a m nwere irite uru nʼọrụ m nara ndị mmadụ ihe. Anaghị m ede nke a nʼakwụkwọ ka a na-ebutere m ihe onyinye. Nʼihi na ọ kaara m mma ka m nwụọ kama m ga-ekwe ka onye ọbụla mee ka ịnya isi m bụrụ ihe efu nʼihi ihe onyinye.
16Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma.
17A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka.
18Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ.
19Ọ bụ ezie na-abụghị m ohu onye ọbụla, ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ niile ka m nwee ike site nʼụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụobi nʼuru nye Kraịst.