13Ọ bụ na unu amataghị na ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu na-esi nʼụlọnsọ ahụ na-eweta ihe ha na-eri? Ndị na-agbakwa odibo nʼebe ịchụ aja na-eketakwa oke nʼihe eji chụọ aja?
14Nʼotu aka ahụ kwa, Onyenwe anyị ekwuola na ndị niile na-ekwusa oziọma ya ga-esi nʼoziọma eweta nri ha ga-eri dị ndụ.
15Ma o nweghị mgbe m jirila ike ndị a m nwere irite uru nʼọrụ m nara ndị mmadụ ihe. Anaghị m ede nke a nʼakwụkwọ ka a na-ebutere m ihe onyinye. Nʼihi na ọ kaara m mma ka m nwụọ kama m ga-ekwe ka onye ọbụla mee ka ịnya isi m bụrụ ihe efu nʼihi ihe onyinye.
16Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma.
17A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka.