1 Ndị Kọrint 9

Nʼebe ndị na-adịghị ike nọ, ana m emekwa dịka ha, ka m nwee ike rite ndị na-adịghị ike nʼuru. Otu ọbụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike site nʼụzọ niile ọbụla zọpụta ụfọdụ.

1 Corinthians 9:22 (UKJV) To the weak became I as weak, that I might gain the weak: I am made all things to all men, that I might by all means save some.

20Nʼebe ndị Juu nọọ, ana m eme dịka onye Juu, ka m nwee ike rite ndị Juu nʼuru. Nʼetiti ndị nọ nʼokpuru iwu, ana m emekwa dịka otu nʼime ndị nọ nʼokpuru iwu (nʼagbanyeghị na mụ onwe m anọghị nʼokpuru iwu), ka m si otu a nwee ike rite ndị nọ nʼokpuru iwu nʼuru.

21Nʼebe ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nọ, emere m onwe m ka onye na-anọghị nʼokpuru iwu (ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe iwu Chineke na-achọ. Ana m emekwa dịka onye nọ nʼokpuru iwu Kraịst), ka m nwee ike rite ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nʼuru.

22Nʼebe ndị na-adịghị ike nọ, ana m emekwa dịka ha, ka m nwee ike rite ndị na-adịghị ike nʼuru. Otu ọbụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike site nʼụzọ niile ọbụla zọpụta ụfọdụ.

23Ana m eme ihe ndị a niile nʼihi oziọma, ma ka m nwekwa ike keta oke na ngọzị ya.

24Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.