19Ha si nʼetiti anyị pụọ, ma ha abụghị ndị nke anyị nʼezie. Nʼihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara aga nʼihu soro anyị nọdụ. Ma ọpụpụ ha pụrụ na-egosi na ọ dịghị onye nʼime ha sonyere anyị.
20Ma unu nwere otite mmanụ sitere nʼOnye Nsọ ahụ, unu niile matakwara ihe niile.
21Ya mere, anaghị m edegara unu akwụkwọ a dịka ndị na-amaghị eziokwu kama nʼihi na unu maara ya na nʼihi na ọ dịghị okwu ụgha ọbụla na-esi nʼeziokwu ahụ apụta.
22Onye bụ onye okwu ụgha? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye na-emegide Kraịst, nʼihi na ọ nabataghị Nna ahụ na Ọkpara ya.
23Onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ enwekwaghị Nna ahụ; ma onye ọbụla nabatara Ọkpara ahụ nwekwara Nna ahụ.