10Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.
11Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya.
12O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị.
13O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya.
14Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa.