12O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị.
13O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya.
14Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa.
15Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke.
16Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.