14Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa.
15Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke.
16Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.
17Nʼụzọ dị otu a, a na-eme ka ịhụnanya zuo oke nʼetiti anyị, ka anyị nwee ike inwe nkwuwa okwu nʼụbọchị ikpe ahụ, nʼihi na dịka ya onwe ya dị, otu a ka anyị onwe anyị dịkwa nʼụwa nke a.
18Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya.