8Mmụọ Nsọ, na mmiri na ọbara, ha atọ kwekọrịtara.
9Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
10Onye ọbụla kweere nʼỌkpara Chineke nwere ọgbụgba ama a nʼobi ya. Ma onye ọbụla na-ekwereghị na Chineke emeela ya ka ọ bụrụ onye ụgha, nʼihi na o kwereghị nʼama ahụ Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
11Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya.
12Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.